Psalms 102

Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị.

Arịrịọ maka ime ebere

1Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị;
ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.
2Ezonarịla m ihu gị
nʼụbọchị nsogbu m.
Gee ntị nʼekpere m,
zakwaa m ngwangwa.

3Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ;
ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.
4Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa;
ana m echefu iri nri m.
5Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ,
enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.
6Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara,
a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.
7Ana m amụ anya abalị niile;
adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.
8Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị;
ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.
9Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m,
anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m
10nʼihi oke iwe gị,
i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.
11Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada.
Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.

12Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi;
aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
13Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ,
nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola;
oge ahụ a kara aka eruola.
14Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị;
mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.
15Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị,
ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.
16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn,
ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.
17Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa;
ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya.

18Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu,
ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:
19Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya,
o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,
20ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ
na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”
21Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn;
a ga-eto ya na Jerusalem,
22mgbe mba niile na alaeze niile,
ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.

23O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m;
o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.
24Nʼihi ya, ekwuru m sị,
“Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ;
ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
25Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa,
eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
26Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide;
ha ga-erichasị dịka akwa ochie.
Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya,
ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.
27Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe,
ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.
28Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide;
ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”
Copyright information for IboBIU